
The Tower of Babel (Genesis 11: 1-9)
Igbo
- Ụwa niile wee na-asụ otu asụsụ, nweekwa otu usoro okwu.
- O wee ruo ka ha nọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ na ha mesịrị hụ otu ndagwurugwu n’ala Shaịna, ha wee biri n’ebe ahụ.
- Ha wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ngwanụ! Ka anyị kpụọ brik, nụọ ya n’ọkụ.” Ha wee jiri brik mere nkume, ma ha ji bitumen mere ụrọ.
- Ha wee sị: “Ngwanụ! Ka anyị wuoro onwe anyị obodo na ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha na-ewu ewu, ka anyị wee ghara ịgbasa n’ebe niile n’ụwa.”
- Jehova wee gbadaa ka ọ hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ụmụ mmadụ wuru.
- E mesịa, Jehova sịrị: “Lee! Ha bụ otu ndị, ha niile na-asụkwa otu asụsụ, nke a bụkwa ihe ha malitere ime. Ugbu a, ọ dịghị ihe ha bu n’obi ime nke ha na-apụghị ime.
- Ngwa! Ka anyị gbadaa ghagbuo asụsụ ha n’ebe ahụ ka ha wee ghara ịnụ asụsụ ibe ha.”
- Jehova wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa dum, ha wee kwụsị iwu obodo ahụ.
- Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya Bebel, n’ihi na n’ebe ahụ ka Jehova ghagburu asụsụ ụwa dum, Jehova mekwara ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’ebe niile n’elu ụwa.
From: Baịbụl Nsọ – Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
[top]
Why not share this page:
Learn languages for free on Duolingo

If you like this site and find it useful, you can support it by making a donation via PayPal or Patreon, or by contributing in other ways. Omniglot is how I make my living.
Note: all links on this site to Amazon.com
, Amazon.co.uk
and Amazon.fr
are affiliate links. This means I earn a commission if you click on any of them and buy something. So by clicking on these links you can help to support this site.
[top]